Acts 24

Ebubo ndị Juu boro Pọl nʼihu Feliks

1Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo. 2Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a. 3Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ. 4Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.

5“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret. 6Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị, 7ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
Ụfọdụ akwụkwọ edebanyeghị amaokwu nke asaa na ụfọdụ okwu dị nʼamaokwu nke asatọ, ebe sịrị na o nyere iwu ka ndị na-ebo ya ebubo pụta nʼihu nʼihu.
8Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”

9Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.

10Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị. 11Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe. 12Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo. 13Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m. 14Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma. 15Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị. 16Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.

17“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja. 18Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla. 19Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m. 20Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye. 21Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’ ”

22Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.” 23O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.

Pọl nʼihu Feliks na nwunye ya

24Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 25Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.” 26Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.

27Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.

Copyright information for IboBIU